Ọdụ ụgbọelu Chuba Ọkadigbo International Airport dị na Ebonyi State, amalitela inwe nnukwu ndị njem.

Written by on June 20, 2025

Ọdụ ụgbọelu Chuba Ọkadigbo International Airport dị na Ọnụeke, bụ isi ụlọ ọrụ nke Ezza South LGA na Ebonyi State, amalitela inwe nnukwu ndị njem dika ụgbọelu azụmahịa si Legọs gbatutere n’ọdụ ụgbọelu ahụ nenweghi nsogbu ọbula.

Nke a na-abịa dika mkpụrụ ụbọchị ole mole ụgbọelu azụmahịa si Abuja malitere igbatu na ọdụ ụgbọelu mba ụwa ahụ.

Ngbatu ụgbọelu ahụ na-enweghị nsogbu ọbula, nakwa ọtụtụ ndị na eme njem na-abubata ebe ahụ, mere ka ọnọdụ na-ekwo ekwo na ọdụ ụgbọelu ahụ.

Ozi kọwara na ahụtara ụgbọala taxis n’ọdụ ụgbọelu ahụ dika ha nọcha n’ebe ahaziri ha ọnọdụ, ma na-eche iburu ndị njem gawa ebe dị iche iche ha na State ahụ.

Ụfọdụ ndị njem gwara ndị nta akụkọ okwu n’ọdọ ụgbọelu ahụ mere ka amata na enweghị ihe mgbochi ọbula n’oge ha malitere njem ha wee rute n’ọdụ ụgbọelu Chuba Ọkadigbo International Airport.

Nwa amadi ahụ n’aha maka ndị ntorobịa nakwa egwuriegwu na State ahụ ma burukwa otu onye n’ime ndị njem ahụ bụ Hon Richard Idike, toro ndị ọrụ n’ọdụ ụgbọelu ahụ ma kọwaa ụzọ ụgbọelu nke ọdụ ụgbọelu dika nke kacha mma na ala anyi a.

Commissioner for Aviation and Transport Technology bu Dr. Odoziaku Ngozi Obichukwu, kwuru na ndaghachi azu adịghị adị n’ọrụ na ọdụ ụgbọelu ahụ.

Dr. Obichukwu rịọrọ ndị na eme njem ka ha na egota akwụkwọ ticket ha site n’aka Ministry of Aviation, ma mgba mbọ bịa n’oge iji nwe ike nweta ụgbọelu ha haziri maka njem ha.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited