Ọkụ latric ebutela otu nwata akwụkwọ mahadum ihe nkwarụ n’oge ọ chọrọ ikodo ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP.
Written by Onyinye on June 24, 2025
Otu nwata akwụkwọ mahadum Taraba State Polytechnic nọ n’afọ nke mbụ ya bụ Lorhee Saanmoyol Paul abụrụla onye nwetara onwe ya na ọnọdụ nke inwe ihe nkwarụ kworo maka ọkụ latric dọrọ ya nke mechara mee ka ebe ya aka ya abụọ.
Ya bụ ihe ọdachi mere na Jalingo bụ isi obodo Taraba State n’abalị iri abụọ n’otu nke ọnwa May gara aga n’akụkụ 3be ebe esi abanye n’ụlọ akwụkwọ ahụ nke okporo ụzọ si roadblock gaa ATC.
Nwata akwụkwọ ahụ ka ya bụ ọkụ latric dọrọ n’oge ọ chọrọ ikodo ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP.
Ozi mere ka amata na ihe elidoro ọkọlọtọ ahụ bụ nke eji igwe rụọ gara suo na ụdọ ọkụ high tension eletrik wire nke mere ka ọ dọrọ nwata akwụkwọ ahụ ozugbo.
Emere ngwa ngwa buga ya n’ụlọ ọgwụ Gilead Hospital dina Jalingo tupu emecha buru ya gawa n’ogige orthopedic nke Taraba State specialist hospital kworo maka etu ya bụ ihe siri buo ịbụ.
Ka agbakirichara ala ihe karịrị mkpụrụ abalị iri abụọ na asatọ, onye dibịa bekee mechara bee ya aka ya abụọ naanị iji zọta ndụ nke mere nwa amadi ahụ enweghịzi aka ugbua.
N’agbanyeghị na gọọmenti state ahụ kwuru na ọ bụ ha ga akwụ ụgwọ niile ejiri mee ya ọgwụ, Paul amalitela ịkwa arịrị ihe yana ije ụwa ya ga eje dịka o kwuru na ụmụ akwụkwọ ibe nọrọ taa malite ule First semester examination mana ya onwe ya abụrụla onye na enweghịzi aka abụọ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.