OLUYEDE EWEGHALA OKWA OCHI AGHA NDI AGHA ELU ALA NIGERIA NA OZUZU OKE YA
Written by admin on December 9, 2024
Nwa amadi ahu jigodu okwa ochi agha izugbe ndi agha elu ala Nigerian Army na okwa Acting Chief of Army Staff bu Lt Gen Olufemi Oluyede anorola taata bu Monday malite olu dika ochi agha izugbe ndi agha ala anyi a na ozuzu oke ya na udi nke akporo Substantive Chief of Army Staff.
Malite olu Lt Gen Oluyede taata na eme ya onye Chief of Army Staff nke iri abuo na ano enwetanugoro na olu agha Nigerian Army.
Iga echeta na obu na abali iri ato nke onwa October afo a bu 2024 ka President Bola Ahmed Tinubu kpolitere Olufemi Oluyede dika onye Acting Chief of Army Staff kwere maka onwu onye ji okwa ochi agha izugbe a oge ahu bu Lt Gen Taoreed Lagbaja.
Onye isi ala anyi mechaziri noro na odi nso a zigara ulo nzuko ukwu Senate aha yabu nwa amadi maka nnyocha nakwa nkwado dika President Tinubu buru uzo site na ogogo rank nke Maj Gen onobu na ya bugo ya na Lt Gen.
Ka osiladi, yabu ulo nzuko ukwu Senate mechara noro na izu uka gara aga nye Lt Gen Oluyede nkwado na okwa ochi agha ala anyi a.