Osisa Ogbako ‘Congress’ Otu Ndorondoro APC Maka Mpaghara South East Aputala Ihe Na Ozuzu Oke Ya

Written by on March 26, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Akpoputala osisa nke oma ndi turu ugo na ogbako Congress otu ndorondoro All Progressives Congress maka mpaghara South East bukwanu nke were onodu unya bu Wednesday na isi obodo Enugu.

Na yabu ogbako nke ndi noro na isi ya gunyere: Gov Hope Uzodimma na achi Imo State, ogbo ya nke Enugu State bu Gov Peter Ndubuisi Mbah nakwa Gov Francis Ogbonna Nwifuru na achi Ebonyi State ka emechara jiri usoro nkwekorita na udi akporo Consensus roputa ndi nchikwa ohuru yabu otu ndorondoro maka mpaghara owuwa anyanwu nke ndida ugwu obodo anyi a.

Esitere na nkwekorita a roputagharia Dr Ijeomah Arodiogbu dika National Vice Chairman na elekota otu ndorondoro a na South East, ebe Chief Innocent Azuoba turu ugo na okwa South East Zonal Secretary.

Ndi ozo nwetara mmeri gunyere: Barr Ernest Mayor Ogbonna dika Zonal Legal Secretary, Hon Henry Onwuahaluonye dika Zonal Publicity Secretary, Barr Chima Kenneth Ogbonna eturu ugo na okwa Zonal Youth Leader, ebe Dr Nwachukwu Stanley Chinedu nwetara okwa Zonal Leader ndi nwere nkwaru, gunyere Dr Oby Ajih nwetara okwa Zonal Woman Leader nakwazi Chief Arinze Ikedife nwetara nturu ugo na okwa Zonal Organizing Secretary.

Na okwu ya ka Gov Peter Mbah bukwanu onye ndu otu ndorondoro APC na Enugu State ma buru onye lere ndi mmadu obia na ogbako a kowara siriri werere ogbako Congress otu ndorondoro a megoro malite na ogogo onumara Ward ruo na nke a akporo Zonal Congress dika ihe ngosi nkwalite ume APC nakwa njikere ndi mpaghara South East ihuna President Bola Ahmed Tinubu naghachiri azu na ochichi nke ugboro abuo na afo 2027.

Gov Mbah toro ndi ndu otu ndorondoro a na South East maka mbo ha ihuna APC kwudosiri ike, ebe oburu ukpo ekene gaara ndi a aroputara ohuru.

Onye nta akuko anyi wetara ozi na ufodu ndi ozo welitere isi sonyere na ogbako a gunyere: onye ahu ji okwa osote onu na ekwuru ulo nzuko nnochite anya ogogo etiti House of Representatives bu Rt Hon Benjamin Kalu, onye ahu jiburu okwa Senate President ala anyi bu Sen Ken Nnamani, onye National Deputy Chairman otu ndorondoro a maka ndida anyanwu ala anyi bu Chief Emma Enukwu, otutu ndi omebe iwu ogogo etiti na nke State, ndi jiburu okwa Governor nakwa nke Minister, gunyere otutu ndi ozo, ebe ndi sitere ulo olu Independent National Electoral Commission INEC wuchiri ma leta ka ihe siri gaa.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited