Osote onye isi ala anyi bu Vice President Kashim Shettima, azọpụla njim site na Abuja gawa mba Ethiopia.
Written by Onyinye on July 28, 2025
Osote onye isi ala anyi bu Vice President Kashim Shettima, anọrọla ụnya bu Sunday zọpụ njim site na Abuja gawa Addis Ababa bu isi obodo mba Ethiopia, iji nọchite anya ala anyi bu Nigeria na ọgbakọ agba nke abụọ nke United Nations Food Systems Summit bu nke ga amalite na abalị iri abuo na asaa ruo abalị iri abuo na itolu n’ọnwa July afọ a bu 2025.
Vice President Shettima ga esonyere ndị ọchịchị mba ụwa ndị ọzọ na yabu mmemme n’ịga n’ihu ngbanwe nke ahịrị ọnụ ahịa coffee ya nakwa itinye aka na nzukọ ndị ọzọ iji kwalite nchekwa nri Nigeria.
A na-atụ anya na nzụkọ a ga-akpọkọta ndị ọchịchị mba ụwa iji tụgharịa uche n’ọganihu enwetara kemgbe ammalitere UN Food Systems Summit na afọ 2021, maka nkwalite nakwa iwulite usoro nri na-adịgide adịgide.
Vice President Shettima ga esonyekwa na mmemme ndị ọzọ n’akụkụ nzukọ ahụ ana eme iji gosipụta ihe atụ n’ezie nke mgbanwe usoro nri, kwalite mgbanwe ihe ọmụma na mmekọrịta, ma kpalie omume mkpọkọta site na ihe akaebe nakwa nkwupụta.
Otu n’ime ihe omume dị n’akụkụ nzukọ ahụ bụ mgbakọ ndị minister na ahụ maka ego ọhaneze, azụmahịa, nakwa itinye ego dị mkpa na mgbanwe, njem, nakwa nnọkọ nkparịta ụka n’intaneti.
Na mkparịta ụka na ọdị nso a site n’aka Task Force na nzukọ UN Food Systems Summit nke abụọ, ka Vice President Shettima kọwapụtara ebumnuche atọ dị mkpa maka ndị nnọchi anya Nigeria, nke mbụ bu idobe ala anyi bu Nigeria dịka onye ndu nke echiche maka mgbanwe usoro nri Africa, nke abụọ bu itinye aka na mmekorita mba ụwa dabara na ihe ndị kacha mkpa n’ime ụlọ, ya nakwa ịkwalite ihe nlere anya nke ngalaba nkeonwe maka mgbanwe nri na mba ụwa.
Nzukọ a bu nke ahaziri site na njikọ aka mba United Nations, government mba Ethiopia nakwa mba Italy.
A na atụ anya na osote onye isi ala anyi ga alọghachite ala anyi bu Nigeria dika emechara nzuko ahụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.