Osote onye isi ala anyi ekwuputala obi nwute ya banyere ọnwụ Late Muhammadu Sani Sami.

Written by on August 18, 2025

Osote onye isi ala anyi bu Vice President Kashim Shettima, ekwuputala obi nwute ya banyere ọnwụ Emir of Zuru na Kebbi State bu Late Major General Muhammadu Sani Sami Retired, Gomo II, ebe ọ kọwara ọnwụ nwa amadi ahụ dika nnukwu ihe funariri ndị ndu ọdinala nakwa ndị agha ala anyi a.

Yabu onye eze ọdinala ma buru onye lagoro ezumike nka dika onye agha ala anyi, nwụrụ na abalị n’ụbọchi Saturday izu ụka a anyi pụrụ n’ime ya n’ụlọ ọgwụ dị na London, n’oge ọ dị afọ iri asatọ na otu dika ọ riachara obere ahụ ọkụ.

N’ozi nkasi obi ozigara ezinụlọ ya ụnya bu Sunday, ka Vice President Shettima, kọwara na Late Emir bu ezigbo onye ndụ bụkwanụ onye ekwesiri inyomi omume ya, dika o tinyere oke nke ya na ọrụ agha ala anyi, amamihe ọchịchị ọdinala, nakwa ezi ọrụ na obodo.

Vice President Shettima, ji aha onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu, government ala anyi bu Nigeria kene ezinụlọ Late Emir, Zuru Emirate Council nakwa ụmụ afọ Kebbi State maka ya bu ọnwụ.

Dika ọ rịọrọ Chukwu Okike Abiama ka onye ya ebe ezumike ebebe ma nyekwa ezinụlọ ya, Zuru Emirate Council, government nakwa ụmụ afọ Kebbi State tinyekwara ala anyi bu Nigeria obi ha ga eji diye yabu ọnwụ.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited