Otu ndorondoro Labour Party ekwuola na ha enwebeghi mkpebi obula gbasara iweputa onye ga a zoro ha okwa onyeisi ala nke afo 2027

Written by on February 18, 2025

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party ekwuola na ha enwebeghi mkpebi ọbụla na ọ bụ na mpaghara South East ka ha ga-esi wepụta onye ga a zọro ha ọkwa onyeisi ala nke afọ 2027.

Nkea sitere n’ọnụ onye ji ọkwa odeakwụkwọ mgbasa ozi ha n’ala anyị bụ Mr Obiora Ifoh bụ onye gwara ndị nta akụkọ nkea na Abuja ụnyaahụ bụ Monday.

Mr Ifoh kwuru nkea dịka nzaghachi nyere akụkọ ahụ malitere fesawa na ekwu na ọ bụ site na mpaghara South East ka onye Presidential candidate nke otu Labour Party ga-esi pụta n’afọ 2027 bụ oge aga anọrọ chịkọba ntụliaka izugbe n’ala anyị gbaa gburugburu.

Onye national publicity secretary ahụ kwudosiri ike na otu Labour Party agaghị ekwu na ọ bụ site n’otu mpaghara ọbụla ga a zọro ọbụla ana azọ azọ. O kwuru na ọ bụ aghọtaghị ihe onyeisi oche ha n’ala anyị bụ Julius Abure kwuru nke ọma bụ ya kpaliri asịrị ahụ.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies