Otu Ohaneze Ndigbo etola State dina mba America maka nkwanyere ugwu puru iche gaara ndi Igbo.
Written by Onyinye on June 26, 2025
Otu ahu jikoro ndi Igbo na uwa niile bu Ohaneze Ndigbo Worldwide eburula ukpo ekene bugara North Carolina State nke mba United States of America maka iweputa abali iri na ano kwa onwa June afo niile dika ubochi ndi Igbo akporo Igbo Day na yabu State dina mba America.
Ozi mere ka amata na aka na achi yabu North Carolina State bu Gov Josh Stein noro na abali onemone gara aga kwuputa abali iri na ano kwa onwa June afo niile dika ubochi puru iche ekeputara maka ndi Igbo na State ahu.
Gov Stein kowara na nke a bu iji menyere ndi Igbo maka ezi ntunye oke ha ihe karigoro afo iri ise ha nogoro na yabu North Carolina State na nkwalite mpaghara ahu.
Yabu aka na achi North Carolina State kwuputara na ebe ndi ahu ndi Igbo kachasi tinye oke maka nkwalite na State ahu nakwa na ogogo etiti mba America gunyere: ngalaba mmuta, olu iwu, nke aruike, mgbasa ozi nke nka na uzu, ikwalite ohere olu nakwazi ngalaba ndi ozo.
Ka osiladi, na ozi onyefere ndi nta akuko unya bu Wednesday ka ode akwukwo mgbasa ozi izugbe na okwa National Publicity Secretary otu Ohaneze Ndigbo bu Dr Ezechi Chukwu mere ka amata na onye President General otu a jikoro ndi Igbo na uwa niile bu Sen John Azuta Mbata bu ukpo ekene na nkata ebugara Gov Josh Stein, govt nakwa ohaneze umu afo North Carolina State maka nhuta ama a gaara ndi Igbo.
Sen Azuta Mbata siteziri na ozi a Dr Ezechi Chukwu weputara kowa omume yabu aka na achi State dina mba America dika nke opuru iche ma buru ihe oma kwesiri ekwesi, ebe otoro ndi Igbo bina yabu North Carolina State maka ezi mbo nakwa omume ha, bu nke kpatara yabu nturu ugo gaara ndi Igbo niile.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.