Otu onye ụkọ Chukwu nke okpukperechi ụka Islam egbuola enyi ya nwaanyị yana ya zutere na ọwa ozi Facebook ma bekasia anụ ahụ ya na Kwara State.
Written by admin on February 17, 2025
Otu onye nkụzi nke ụka Islam gbara afọ iri abụọ na itoolu bụ Abdulrahman Bello abụrụla onye aka ndị uwe ojii na Kwara State kpara ụnyaahụ bụ Saturday maka ebubo na o gburu enyi ya nwaanyị nọ n’afọ nke ikpeazụ ya na ụlọ akwụkwọ Kwara State College of education bụ Yetunde Lawal.
Bello ka e kwuru na o zutere Yetunde bụ onye gbara afọ iri abụọ na ise n’ọwa ozi ma gwa ya ka ọ bịa n’ụlọ ya n’abalị iri nke ọnwa Febrụwarị site oku ekwe ntị ha nwere.
Nwoke ahụ afọ tara mmiri ka ozi kwuru na o mechara gbuo enyi nwaanyị ahụ n’obodo Ganmo nke dị na mpụga Ilorin bụ isi obodo Kwara State ma bekasia anụ ahụ ya.
Onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndị uwe na state ahụ bụ Adetoun Ejire Adeyemi bu ya gwara ndị nta akụkọ nkea taa bụ ụka ma kwuo na ha amalitela ime nyochaa banyere ọnwụ nwata nwaanyị ahụ.