President Donald Trump adila njikere inabata ndi ndu mba ise sitere mpaghara ala isi oji.

Written by on July 9, 2025

Aka n’ achi mba America bu President Donald Trump ga anoro tata bu Wednesday nabata ndi ndu mba ise maka nri ehihie n’ ogige isi ulo olu mba ahu bu White House iji tuo aro banyere usoro azu m ahia nakwa otutu ihe ndi ozo.

Habu ndi ndu mba ise sitere mpaghara Africa gunyere: onye isi ala mba Senegal, ogbo ya nke Liberia, nke mba Guinea-Bissau, nke Mauritania nakwa onye isi ala mba Gabon.

Habu ndi ndu sitere mba di iche iche gwara ndi nta akuko, na ha n’ atu anya itinye onu n’ ihe banyere azu m ahia, iwube akuluba, nchekwa nakwa otutu ihe ndi ozo n’ oge ahu.

Nzuko a n’ abia dika ochichi President Donald Trump gbadosiri anya Ike n’ ihe banyere utu isi nakwa azu m ahia tinyekwara ihu na enwere usoro kwudosiri Ike esi ekesa aku onatarachi.

K’ osiladi, mba ise ndi a ka ozi n’ akowa na ha enweghi aku onatarachi dika otutu mba ndi ozo di na mpaghara ala isi oji.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited