Puku kwuru puku ndị mmadụ na mba Australia emela njem ngaghari iwe na ọtụtụ obodo dịgasị na mba ahụ.
Written by Onyinye on August 25, 2025
Puku kwuru puku ndị mmadụ na mba Australia emela njem ngaghari iwe na ọtụtụ obodo dịgasị na mba ahụ, dika ha na akpọ ọkụ ka agbatara ụmụ afọ Gaza dị na mba Palestine bu ndị ana egbu kwa ụbọchị nakwa ndị nke na akwụ agụ na mba ahụ ọsọ enyemaka.
Ihe karịrị otu iri na anọ mere njem ngaghari iwe na mpaghara dị iche iche ụnya bu Sunday na mba Australia, dika otu Palestine Action kọwara na njem ngaghari ahụ wekwara ọnọdụ na Sydney bu isi obodo mba ahụ, ya na Brisbane nakwa Melbourne.
Puku kwuru puku ndị mmadụ ahụ mere njem ngaghari, kpọrọ okwu ka adaa mba Israel ngha ma kwụsị iso ha na agba mgbere ngwa ọgu bu nke ha ji ebu agha emegide ụmụ afọ Gaza dị na mba Palestine.
Ndị otu Palestine Action bụkwanụ ndị chikọbara njem ngaghari iwe ahụ, kọwara na ihe karịrị mmadụ narị puku atọ sonyere na yabụ njem ngaghari iwe, ebe ahụtara ihe ederede dị iche iche ha dere na placards ma na etu mkpu ka atọghapu mba Palestine.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.