Rashidaat Ajibade n’agbara otu Super Falcons nke ụmụ nwaanyị ala anyị arịọla ndị ihe ha na amasị nkwado dịka egwuregwu ha malitere na Uhuruchi taa na asọmpi WAFCON.
Written by Onyinye on July 7, 2025
Ọgba bọọlụ ụkwụ na aghọ n’otu Super Falcons ụmụ nwaanyị ala anyị bụ Rashidaat Ajibade arịọla ụmụ afọ ala anyị nkwado iji nyere ha aka ime nke ọma n’oge asọmpi Women’s African Cup of Nations WAFCON malitere ụnyaahụ bụ Satọdee.
Otu Super Falconets na-eme ihe niile ike kwere iji turu ugo na asọmpi ahụ agba nke iri ya bụ nke na e were ọnọdụ na mba Morocco.
Mba ndị nku ha kacha dị elu na asọmpi ahụ gụnyere mba Morocco, otu Bayana Bayana sitere na mba South Africa ndị ọ bụ ha ka meriri mgbe ikpeazụ a sọrọ ya bụ mpi, Coppers Queens nke mba Zambia tinyere otu Black Queens sitere na mba Ghana yana ọtụtụ mba ndị ọzọ.
Ajibade kwenyesiri ike na ọ bụrụ na ụmụ afọ ala anyị a gaa n’ihu na e kwere ha Hallelujah ga e nyere ha aka n’ebe ọ dị oke elu ituru ugo na asọmpi ahụ.
Otu Super Falconets malitere asọmpi ha n’oge ọ kụrụ elekere ise nke mgbede taa bụ ụka n’obodo Casablanca hana mba Tunisia.
Anyị ga-eme ka ịmata ihe okwe gbatara na egwuregwu ahụ n’oge akụkọ ụwa anyị na abia n’ọdịnihu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.