Ụlọ ọrụ Anambra State Board of Internal Revenue na njikọ aka ụlọ ọrụ State Anti-Touting Agency anwuchiela ụfọdụ ndị ahụ na anakọta ego n’ụzọ iwu na akwadoghi na State ahụ.

Written by on August 4, 2025

Ụlọ ọrụ Anambra State Board of Internal Revenue na njikọ aka ụlọ ọrụ State Anti-Touting Agency, anwuchiela ma kpọpu n’ụlọ ikpe ụfọdụ ndị ahụ na anakọta ego n’ụzọ iwu na akwadoghi dika mbọ ha na agba iji kpochapụ ndị omekome bu ndi na egosi onwe ha dika ndị na anara government ego na State ahụ.

Nkea putara ihe ụnya bu Sunday site n’aka onye isi oche nke ụlọ ọrụ AIRS bu Greg Ezeilo, dika ọ kọwara na ụlọ ọrụ ahụ na ebu agha emegide ndị ahụ na anakọta ego n’ụzọ iwu na akwadoghi nakwa agwa ekperime na State ahụ.

Ọ gara n’iru riọkwa ọhaneze ka ha kee nkwucha ma gbaa mbọ kpọturu ndị ọrụ nchekwa State ahụ mgbe ọbula ha hụtara ihe dị agha na gburugburu ha iji nye aka buo agha megide ndi ahụ na anakọta ego n’ụzọ iwu na akwadoghi nakwa ndị ekperime ọsọ ụkwụ eru ala na State ahụ.

Nke ahụ bu iji mee ka ụmụ afọ State ahụ mata na agwa ọbula bu nke iwu na akwadoghi abughizi ihe government State ahụ ga eleghara anya.

Ozi kọwara na ụfọdụ ndị ahụ ana enyo enyo bu ndi anwụchiri na UNIZIK Junction ebe ha na anakọta ndị ọkwụ gbọala ego n’ụzọ iwu na akwadoghi, ebe anwụchiri ụfọdụ na Regina Junction, Awka, ebe ha na anakọta ndị n’anya keke ego n’ụzọ iwu na akwadoghi.

Ndị ahụ ana enyo enyo anwụchiri bu ndi akpụgara Anambra Internal Revenue maka nyocha, dika akpụpụrụ ha n’ụlọ ikpe ebe ekpere ha ikpe ma tụọ ha nga ọnwa ịsịị.

Mgbo ndị ụlọ ọrụ ahụ gbara iji nwuchikọ ụfọdụ ndị a na anakọta ego n’ụzọ iwu na akwadoghi bu nke ndị bi na State ahụ nakwa ndị nwere ụlọ ahịa toro n’ebe ọdị ukwu etu ha siri kpochapụ ndị ekperime ahụ na egbochi enweghi udo na State ahụ.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited