United Nations Chief bu Antonio Guterres rịọrọ ndị international community taata bu Monday ka ha jụụ agụụ dịka ngwa agha.

Written by on July 28, 2025

United Nations Chief bu Antonio Guterres rịọrọ ndị international community taata bu Monday ka ha jụụ agụụ dịka ngwa agha.

Ụlọ ọrụ UN na-adọ aka na ntị banyere agụụ na-eyi ndụ ndị mmadụ egwu na Gaza dika mba ụwa na-ewulite okwu maka nkwụsị agha ahụ iji mee ka ọrụ enyemaka na adị mfe.

Government mba Israel nke nọ n’okpuru Prime Minister Benjamin Netanyahu, gọnariri na ya ji agụ mere ngwa ọgu, kama oboro ebubu na ndi ụlọ ọrụ enyemaka achọghị ịga zigara ndị mmadụ enyemaka na okeala Gaza.

Guterres gwara UN na ọgbakọ achikobara na mba Ethiopia na mgbanwe eligwe na emkpa mmepụta nri n’ubi, ịkesa nri nakwa enyemaka ahụ n’ebe ọdị ukwu, bukwanu nke kpatara oke agụ na akawanye njọ na Gaza ruo mba Sudan nakwa ebe ndị ọzọ.

Ozi putara ihe ụnya bu Sunday kọwara na a nachọ ibenata ọgu ahụ iji nye ndị UN nakwa ndi ụlọ ọrụ enyemaka ndị ọzọ ohere ka ha nwe ike gbochie oke agụ, dika ndi ụlọ ọrụ World Health Organisation dọrọ aka na ntị na erighị ihe na-edozi aha na akawanye njọ.

Onye regional director nke mba UN bu Othman Belbeisi gwara ndị nta akụkọ na mba kacha ata ahụhụ enweteghi enyemaka site n’ụlọ ọrụ ndị enyemaka bu mba Sudan.

Dika omere ka amata na kamgbe ọnwa April afọ 2023, na mba Sudan nọ na nkewa kwere maka mgba dị egwu dị n’etiti army chief bu Abdel Fattah al-Burhan nakwa Mohamed Hamdan Daglo, bu onye paramilitary Rapid Support Force.

Ọgụ ahụ egbuola iri puku kwuru iri puku ma chụpụ ihe karịrị nde mmadụ asaa.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited