Fr. Mbaka Akwadola Onye Otu Ndorondoro PDP Na Ntule aka Okpuruochichi Ime Obodo Enugu State

Written by on September 16, 2024

Nwa amadi ahu ji okwa Spiritual Director nyere ogige ekpere Adoration Ministry, Enugu, Nigeria bu Rev Fr Ejike Mbaka ekwuputala nkwado ya nyere onye ahu ji okoloto otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP azo okwa onye isi oche okpuruochichi Enugu East LGA na ntule aka ochichi Local Govt Elections n’ akpudobe nso na State a bu Pastor Beloved-Dan Anike.

Rev Fr Mbaka nke bu onye ukochukwu nzuko nso Catholic na Enugu Diocese mere ka nke a puta ihe unya bu uka n’ aja Misa were onodu na yabu ogige Adoration Ministry dina mpaghara Umuchigbo, Iji-Nike nke Enugu East LGA bukwanu aja Misa Pastor Anike sonyere.

Yabu ukochukwu kowara Pastor Beloved-Dan Anike dika ezigbo mmadu, okachasi ihe omere ka amata na nwa amadi a so gba mbo ihuna onwetara ala ebe ahu arunyere yabu ogige ekpere Adoration Ministry.

Otoro nwa amadi a nakwa otu ndorondoro PDP maka iweputa ya dika onye Local Govt Chairmanship Candidate nyere yabu ntule aka ochichi.

Rev Fr Ejike Mbaka kwuputara na nkwado ya gaara yabu onye PDP Local Govt Chairmanship Candidate ruru otu nari per cent ma elegara anya n’ ihe okowara ya dika ezigbo mmadu.

Iga echeta n’ obu n’ ubochi Saturday bu ngwucha izu uka a anyi nona ime ya ma buru abali iri abuo na otu nke onwa September, afo 2024 ka ulo olu Enugu State Independent Electoral Commission ENSIEC ga achikoba ntule aka ochichi Local Govt Elections nyere okpuru ochichi ime obodo iri na asaa nakwa onumara Wards di nari abuo na iri isii enwere na State a.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies