Akatola Atumatu Ibupu Ikpe Ebubo Onodu Ngahe Uzo Asambodo President Bola Ahmed Tinubu Site Na Kano Buga Ya Abuja

Written by on August 20, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Otu kwuru na onwe ya na azo maka ikike diara ndi mmadu ma buru otu ogige Centre for Reform and Public Advocacy CFRPA ajula atumatu isite na Kano State bufee ikpe akwukwo ogbara megide ebubo edoghi anya bu asambodo President Bola Ahmed Tinubu buga na ulo ikpe nke Federal High Court dina Abuja.

Otu a ka emere ka amata na onoro na onwa June afo a bu 2026 gba akwukwo na ulo ikpe Federal High Court dina isi obodo Kano megide ebubo onodu edoghi anya nke asambodo ndi ahu President Tinubu nyefere maka izo okwa onye isi ala na ntule aka ochichi izugbe afo 2027.

CFRPA na akowa na onodu banyere habu asambodo megidere alaka section 131 nakwa nke 137 subsection 1 article J na iwu ala anyi emeputata na afo 1999 bukwanu nke akpatughariri aka.

Ka osiladi, na ozi onyefere ndi nta akuko unya bu Wednesday ka onye isi ngalaba iwu nyere otu a bu Mazi Kalu Kalu Agu boro ebubo sina ulo ikpe Federal High Court choro isite na ebe ahu agbara akwukwo a na Kano bufee ikpe a gawa Abuja, ma buru nke okowara dika atumatu iweta nruru aka megide ikpe nkwumoto ya.

Omere ka amata na obu ndi okaiwu President Tinubu detara akwukwo ayiyo ka ulo ikpe ahu bufee ikpe a gawa Abuja, ebe okowaziri etu esi nye nkwado ime nke a dika nke na egosi ujo agwa imegbu Okeke maka odimma Okafor.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited