Nigeria Na Mba Thailand Ebinyela Aka Nkwekorita Ezi Onodu Akuluba Na Azum Ahia

Written by on August 26, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ala anyi bu Nigeria nakwa mba Thailand ekwuputala mkpebi ha ikwalite udo mmekorita akuluba nakwa ezi onodu azum ahia na iji ego achu nta ego maka odimma habu mba abuo.

Nke a putara ihe unya bu Tuesday na Abuja site na onu Minister ala anyi na ahu maka odimma mba ofesi bu Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu na okwu ya oge ala anyi nakwa mba Thailand binyechara aka nkwekorita maka yabu ezi udo mmekorita na isi ulo olu Ministry ya.

Na ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi na uhuruchi yabu unya ka onye enyemaka puru iche nyere yabu Minister na ihe metutara nzikorita ozi nakwa mgbasa ozi ogbaru ohuru bu Dr Magnus Eze, ka omere ka amata na Amb Odumegwu-Ojukwu binyere aka na nkwekorita a na aha ochichi Nigeria, ebe osote onowu na okwa Deputy Prime Minister ma buru Minister odimma mba ofesi nyere mba Thailand bu Sihasak Phuangketkeow binyere aka na aha mba ya.

Dr Eze gwara ngalaba akuko uwa anyi na Amb Odumegwu-Ojukwu noro na oge mbinye aka a nabata atumatu Thailand-Africa Initiative, ma kpo oku njiko aka na olu nke otu Nigerian Technical Aid Corps nakwa Thailand International Corporation Agency iji kwalite aka nka nke nka na uzu nakwa mmepe ga adigide.

Yabu Minister ala anyi tokwara usoro Thailand-Nigeria Sustainable Agricultural Technology Development Agency na aga na iru ugbu a, dika okporo oku mgbatikwu aka ya na mpaghara ndi ozo dina ala anyi, ebe oyoro maka iguzobe ulo olu Commission nyere ala anyi nakwa mba Thailand maka nkwekorita a ebinyere aka.

Na nke ya ka yabu onye Deputy Prime Minister mba Thailand bu Phuangketkeow kowara Nigeria dika ide ji ulo akuluba nyere ala isi oji Africa, ma kowa nkwekorita a ebinyere aka dika nke ga akwalite akuluba, azum ahia nakwa ezi onodu habu mba abuo.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited