Ndị Nchikwa Ulo Olu NFF Agbala Alukwaghim Na Ochichi Ha
Written by admin on August 27, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Onye isi na okwa President ulo olu na achikwa egwuregwu ball ukwu ala anyi akporo Nigeria Football Federation NFF bu Ibrahim Gusau nakwa ndi ozo agbala alukwaghim na okwa ochichi ha.
Nke a pụtara ihe na ozuzu oke na abali pụtara taata bu Thursday site na ozi ulo akwukwo akuko Vanguard Newspaper nyochaputara.
Ndi ahu so Gusau gba alukwaghim bu ndi otu board nchikwa yabu ulo olu NFF ma buru nke sochiri nnukwute oku anoro na odi nso a acha ha kwere ida mba na usoro nchikwa egwuregwu ball ala anyi a.
Nke ikpeazu na amaghi eme habu ndi nchikwa ulo olu NFF bu ima afo na ala nke umunwaanyi egwuregwu ala anyi bu Super Falcons bukwanu ndi na adighi ike tozuo oke iga iko mba uwa nke umunwaanyi ga ewere onodu na mba Brazil, nakwa emeghi nke oma na asompi iko umunwaanyi ala isi oji Africa agbatopuru na odi nso a.
Ka osiladi, ndi nchekwa oje na mmuo Department of State Services DSS ka ozi mere ka amata na ha esonyegoro ndi nchekwa ozo na ime nnyocha banyere ebubo agwa ekperima ego di ijeri Naira iri na asaa govt etiti nyefere yabu ulo olu NFF maka ugwo olu ndi ogba ball ma buru nke ana akowa na habu ndi nchikwa gbara alukwaghim mara mmiri ojo.

