Ego Mbelata Oke Ngala Onu Mmanu: Naira Nwere Ike Igbatu Puku Naira Ano Maka Otu Dollar Ma Eweghachite Ya – Oyedele
Written by admin on October 20, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Minister ala anyi na ahu maka ego ma burukwa Minister na ahu maka nchikwa akuluba bu Taiwo Oyedele adola umu afo Nigeria aka na nti megide gani gani iweghachite ego mbeleta oke ngala onu mmanu amara dika Fuel Subsidy na ala anyi a.
Oyedele kwuru nke a na okwu ogwara ndi nta akuko na nzuko kwa afo otu International Monetary Fund IMF nakwa ulo oba ego mba uwa bu World Bank na Bangkok bu isi obodo mba Thailand.
Oyiri egwu sina iweghachite yabu ego Fuel Subsidy nwere ike ikwanye akuluba ala anyi na ajo onodu nke na agana agbanwezi otu Dollar na agbata ego di puku Naira ato ruo puku Naira ano.
Ogara na iru kowa na nke a ga achupu ntukwasa obi ndi ji ego achu nta ego ibata tinye ego na akuluba ala anyi.
Iga echetazi na obu na abali iri abuo na iteolu nke onwa May afo 2023 bu ubochi eduru President Bola Ahmed Tinubu na iyi olu ka onoro kwuputa mwepu ego subsidy na mmanu ala anyi, ma buru nke noro kemgbe ahu bute ajo onodu elu oji nke onu ego ana ere mmanu na obodo a bu Nigeria.
