Ajo Onodu Nchekwa: Tinubu Na Anwa Ike Ya Maka Nchekwa Nigeria – Yari
Written by admin on October 20, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Onye Director General otu achum nta nkwado okwa onye isi ala gaara otu ndorondoro All Progressives Congress APC bu Sen Abdulaziz Yari emela ka amata na obughi naani President Bola Ahmed Tinubu ka uta diara banyere nkawanye njo nke ajo onodu nchekwa ala anyi a.
Sen Yari jiburu okwa Governor Zamfara State kwuputara nke a unya bu Monday na njem mkpoturu omegara Kebbi State bukwanu ebe onoro nwe ndagharita nti nyere aka na achi State ahu bu Gov Nasir Idris, ndi eze odinala nakwa otutu ndi ozo onu na eru na okwu na otu ndorondoro APC.
Yabu onye isi izugbe otu APC Presidential Campaign Council kowara na Late President Muhammadu Buhari bu onye agha lagoro ezum ike nka na ogogo rank nke General nwara oke ya megide ajo onodu nchekwa, mana onweghi ihe omenwuru ya.
Nke a ka okowara si; ma obuzi President Tinubu na abughidi onye agha ka uta niile ga agara ime ihe onye lagoro ezum ike nka na ogogo General ndi agha na emenwughi banyere nchekwa?
Sen Abdulaziz Yari kowaziri na ochichi President Tinubu na anwa oke ya iweta ogbugbo nyere ka ha raa bu ihe aka mgba chere nchekwa ala anyi a.


