Mee Nnyocha Nke Oma Banyere Onwu Dele Giwa – NGE Na Agwa Ochichi Nigeria
Written by admin on October 21, 2026
by Maduabuchi Onwe

IMG_9178_1792128288
Otu Nigerian Guild Of Editor NGE akpokuola government Nigeria ka omee nnyocha nke oma gbasara onwu onye nta akuko ahu ama ama na ala anyi edulara mmuo n’ike n’ime afo iri ano gara aga na Nigeria bu Dele Giwa, iji choputa ihe nille gbasara onwuya ma nye ya ikpe nkwumoto.
Otu NGE kwuputere nke a dika emere ncheta afo iri ano kamgbe ejicha mgbo ogbunigwe bukwanu nke etinyere na ngwugwu eji ekechi ederede letter gbuo nwamadi ahu na abali iri na iteolu nke onwa October afo 1986.
N’okwu ya na mmeme ahu ka onye isi oche yabu otu NGE bu Eze Anaba nakwa onye ode akwukwo izugbe ya bu Onuoha Ukeh mere ka amata n’onwu nwamadi ahu nakwa onodu ochichi Nigeria si wee na adoghachi aka elekere azu n’ihe gbasara inye ya ikpe nkwumoto n’egosi n’ikikere ndi nta akuko nwere igbasa ozi n’obodo anyi a ka nwere nkwaru, ma na akwalitekwa onodu esi akpagbu ndi nta akuko.
Iga echetazi na Dele Giwa bu otu n’ime mmadu ano ahu choputara ma guzobe akwukwo akuko amara dika Newswatch magazine na afo 1984 bukwanu akwukwo akuko izizi ana edeputawa kwa izu obuna na Nigeria amara n’olu beeke dika weekly news magazine.