Ntule Aka Okpuruochichi Ime Obodo Ana Acho Ime Na Anambra State Megidere Iwu – Labour Party

Written by on September 17, 2024

Otu ndorondoro Labour Party na Anambra State akowala ntule aka ochichi Local Govt Elections ana akwadebe na State ahu dika nke ana ahazi n’ usoro megidere iwu.

Labour Party boro ebubo sina obu ulo olu ntule aka ochichi Anambra State Independent Electoral Commission ANSIEC gbasoro yabu usoro megide iwu n’ ihe banyere nhazi ntule aka okpuruochichi ahu.

N’ ogbako otu ndorondoro a chikobara ndi nta akuko na Awka bu isi obodo State ahu ka Labour Party mere ka amata hoo-ha n’ ogaghi esonyere na ntule aka ochichi ahu.

N’ okwu ya na yabu ogbako ndi nta akuko ka onye ode akwukwo mgbasa ozi otu ndorondoro Labour Party na Anambra State bu Chief Theo Egbe kwuputara na ha edegalara ulo olu ANSIEC akwukwo iji kowara ya n’ otu ndorondoro a anaghi esonyere na yabu Local Govt Elections.

Chief Egbe gwara ndi nta akuko na ndi ozo yabu akwukwo gaara bu Commissioner ndi uwe oji ala anyi na State ahu, onye Director ndi nchekwa oje na mmuo Department of State Services DSS nakwa ndi ozo kwesiri ekwesi.

Oboro ebubo sina agbasoghi iwu ntule aka ochichi nke 2022 Electoral Act n’ usoro nakwa nhazi ana eme banyere ntule aka ochichi ahu.

Yabu onye Publicity Secretary otu ndorondoro Labour Party na Anambra State meziri ka amata n’ otu ndorondoro ya agbagori akwukwo n’ ulo ikpe megide ulo nzuko omebe iwu Anambra State House of Assembly nakwa ndi ozo banyere ntule aka ochichi ahu.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies