Gov Fubara Achituola Onye Isi Oche Otu Okpuruochichi Ime Obodo Na Rivers State

Written by on September 18, 2024

Aka n’ achi Rivers State bu Gov Siminalayi Fubara agbalara onye ahu ji okwa onye isi oche otu ochichi nchere oge akporo Caretaker Committee Chairman nyere Akuku-Toru LGA nke State ahu bu Hon Otonye Briggs ugbonwamkpi n’ okwa olu ya.

N’ ozi sitere n’ obi ochichi State ahu dina Port Harcourt banye ndi nta akuko aka taata bu Wednesday ka Gov Fubara noro mee ngwangwa kpolite Hon Bitebobo Nelson Amieye dika onye Caretaker Committee Chairman ohuru yabu okpuru ochichi ime obodo.

Aka n’ achi Rivers State nyere ntuzi aka ka Hon Briggs ogbara ugbonwamkpi mee ngwangwa nyefe ihe niile bu nke govt di ya n’ aka n’ aka Hon Amieye okpolitere ohuru.

Were ruo n’ oge ndeko akuko a n’ ehihe taata ka govt Rivers State enwebeghi ka osiri nye nkowa ihe kpatara nchitu n’ okwa yabu onye isi oche okpuru ochichi ime obodo nakwa mkpolite n’ okwa nke onye ahu okpolitere ohuru.

Ka osiladi, ndi nta akuko siri imi nnyocha n’ ala nyochaputa na nke a aghaghi ibu kwere maka ebubo adighi ike nwa amadi ahu weputa usoro nkwalite gaara ndi nkwado yabu Gov Siminalayi Fubara sitere okpuru ochichi ime obodo ya.

Ozi kowara na Gov Fubara noro n’ oge okpolitere ndi Caretaker Committee Chairmen maka okpuru ochichi ime obodo niile enwere na Rivers State nye ha iwu iweputa usoro nkwalite nwa bekee kporo Empowerment Programme gaara ndi niile n’ akwado ya n’ okpuru ochichi ha di iche iche.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies