Otu ụlọrụ Commission enwere n’ọchịchị ndị agha nke mba Niger Republic akwadola ka ndị agha obodo ahụ nọ kwuo n’ọchịchị ihe ruru afọ ise na abia tupu ha enyefe ọchịchị n’aka ndị nkịtị.

Written by on February 21, 2025

Otu ụlọrụ Commission e nwere na ọchịchị ndị agha na mba Niger Republic akwadola ka anọkwuo ihe ruru afọ ise ugbua tupu ana enyefe ọkwa ọchịchị obodo ahụ n’aka ndị nkịtị.

Ịga echeta na ndị agha akpọrọ military junta nọrọ n’afọ 2023 n’oge ha kwaturu ọchịchị President Mohammed Bazoum were kwuo na ọ bụ naanị afọ atọ ka ha ga-anọ tupu ha a pụọ n’ọchịchị bụkwa nke otu ECOWAS nọrọ n’oge ahụ ju ịnabata.

Mana mba Mali, Niger Republic yana Burkina Faso mechara si n’otu ahụ pụọ kworo maka esemokwu metụtara okwe ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ya bụ ụlọrụ Commission kwuru na tupu afọ ise ahụ a gaa na aga enye ohere maka otu ndọrọndọrọ ọchịchị chọrọ Ị guzobe onwe ha ihe dịka atọ, ise ma ọ bụ karịa. Ebe ndị ahụ nọ n’ọchịchị ndị agha ugbua ga eketakwa oke na ya.

Ihe ndị ọzọ ụlọrụ ahụ mere gụnyere ibuli Brigadier General Abdourahamane Tiani onye ọ bụ ya du ndị agha kwaturu ọchịchị mba ahụ ka ọ gbagozie nọkwa nke Army General.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies