Mmadu iri abuo na ise atufola ndu ha n’ike na mwakpo ndi oji egbe wakporo ogige Kashmir di na mba India.

Written by on April 23, 2025

N’ akuko ozo dika ibe ya, nnukwute akpata oyi nakwa iwe n’ari ibe ya elu dika ndi oji egbe gburu mmadu iri abuo na ise ndi biara njem nneru anya na ogige Kashmir di na mba India ,ebe ozi n’ akowa na ufodu ndi nke nwetara ihe mmeru aru kana azokwa ndu ha azo k’ odi ugbua.

Yabu mwakpo bu unya bu Tuesday ka omere na mpaghara Pahalgam bu Obodo ama ama maka nnukwute ugwu ha nwere.

Onwebeghi ndi achoputara n’ obu ha mere yabu mwakpo kama na ufodu ndi nta akuko n’ akowa na ihe onyunyo ha hutara n’ egosi n’ obu ndi oji egbe.

Onye prime minister mba ahu bu Narendra modi akagbuola njem okwa doro imegara mba Saudi Arabia ma naghachite azu na Delhi.

Ogige Kashmir bu nke mba India nakwa Pakistan n’ azo kemgbe aburula nke butegoro nnukwute mwakpo na mpaghara Delhi ma taa isi puku kwuru puku ndi mmadu.

Onye ji okwa region’s chief minister mba ahu bu Omar Abdullahi mere ka amata na mwakpo nkea kariri nke n’ emebu kemgbe afor ndi gara aga.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited