Ndị uweojii na Rivers State emela ka amata na ha zọpụtara otu nwoke ndi ntọri tọrọ na State ahụ.
Written by Onyinye on July 11, 2025
Ndị uweojii na Rivers State mere ka amata na ha azọpụtala Mazi Matthew John Zephaniah bu onye ndi ntọri tọrọ na Oyigbo dị na Oyigbo LGA na State ahụ.
Ha kọwara na ha menwuru nke ahụ site n’inweta ozi bara ha uru gbasara ndi ntọri ahụ ya nakwa njikọ aka otu OSPAC nakwa ndị vigilante group, dika ha zọpụrụ njem gawa n’ebe ndị ntọri ahụ ji mere isi ọnọdụ ha na Agbo-Nchia Forest.
Ọnụ na ekwuchitere ndị uweojii na State ahụ bu SP Grace Iringe-Koko, mere ka nkea puta ihe ụnya bu Wednesday na Port Harcourt bu isi obodo State ahụ.
SP Grace Iringe-Koko gara n’iru kọwaa na oge ndị ntọri ahụ hụrụ ndị uweojii ha malite lusowe ha ọgu, dika ha zokọritara mgbo egbe ka mmiri mana ndị uweojii ahụ mechara merie ha ebe ha bucha mgbo egbe rie mbọ mbọ ọsọ.
Ọ kọwara na ha nwetakwa ọtụtụ ihe ndi ọzọ nwa amadi ahụ ha tọrọ nwe n’ebe ahụ ndị gụnyere, HP Laptop, Redmi phone, Android phones abụọ nakwa Smart wristwatch.
SP Grace Iringe-Koko gakwara n’iru mee ka amata na ihe ndi ahụ ha nwetara n’ebe ahụ ka nọ n’aka ndị uweojii, dika ha na agba mbọ iji nwuchikọ ndị ntọri ahụ bu mgbo egbe rie mbọ mbọ ọsọ.
Commissioner ndi uweojii na State ahụ bu CP Olugbenga Adepoju, kwere ụmụ afọ State ahụ nkwa na ndi uweojii na agba mbọ na etinye uchu n’ọrụ ha iji weta nchekwa gara ndu ndi mmadụ nakwa ihe ha nwere na State ahụ.
Ọ rịọrọ ohaneze ka ha gba mbọ hụ na ha kpọturu ndị uweojii ma ọbu ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ oge ọbula ha hụtara onye bu apa mgbọ egbe na mpaghara ahụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.