Ndi Agha Nigeria Anaputala Otutu Ndi Danyere Na Onyia Ojo Ndi Isi Ekwe Onwu Na Sokoto State
Written by admin on June 28, 2026
by Chidimma Kama
Ndị agha ala anyị nke Sector 2, Operation Fansan Yamma, azọpụtala mmadụ ịsịị ndị ntọrị tọrọ n’oge ha nọ ọrụ na Sabon Birni LGA na Sokoto State.

Nigerian-Army
Nkea pụtara ihe site n’ozi ha wepụtara n’ọwa ozi mmekọrịta ọhaneze ha ụnya bụ Saturday, dịka ozi ahụ kọwara na nzọpụta ahụ were ọnọdụ n’ụbọchi Thursday izu ụka a anyị pụrụ n’ime ya.
Ebe ozi ahụ gara n’iru kọwa na ndị agha ala anyị nke Sector 2, Operation Fansan Yamma zọputara mmadụ ịsịị ndị ntọrị tọrọ na Sokoto State dịka ha zutechara ndị ọsọ chi egbu terrorists jị ọgba tumtum motorcycle atọ na Sabon Birni LGA, n’oge habụ ndị oso chi egbu terrorists bu ndị ahụ ha tọrọ site na Kure village aga n’ebe ọzọ mana ha ghapụrụ ndị ahụ ha tọrọ rịe mbọmbọ ọsọ ozugbo ozugbo ha hụrụ ndị agha ala anyị.
Ozi ahụ nyezịrị aha ndị ahụ azọpụtara dịka Usman gbara afọ ịrị abụọ na anọ, Baba Usman gbara afọ ịrị ịse na ịsịị, Hassan gbara afọ ịrị abụọ na abụọ, Sunusi gbara afọ ịrị abụọ na atọ, Abdullahi Yahaya gbara afọ ịrị abụọ na asatọ nakwa Sule gbara afọ ịrị na ịse.
Na nke ha ka ụmụ afọ obodo ahụ kenere ndị agha ala anyị n’ebe ọdị ukwu kwere maka mbọ ha na agba nakwa agha ha na ebuso ndị ịsị ekwe ọnwụ bandits, ndị oso chi egbu terrorists nakwa ndị ekperima ndị ọzọ na State ahụ gba gburugburu.