Ochichi Abia State Agbaruola Iru Megide Ikpochisi Owara Mmiri Na State Ahu

Written by on June 28, 2026

Chidimma Kama

Gọọmenti Abia State enyela ndị bị na State ahụ ndụmọdụ ka ha ghara ịna ejị ahịhịa ekpochị ọwara mmịrị.

Nkea pụtara ihe site n’aka Commissioner n’ahụ maka gburugburu bụ Mazi Philomen Ogbonna, ụnya bụ Saturday na Umuahia bụ ịsị obodo State ahụ dịka ha ghazịchara njem ngaghari mkpocha na nzacha.

Alex-Otti-1

O gara n’iru kọwa na gọọmenti State ahụ dị njikere itinye uchu n’ọrụ iji gbochie ọrịa nakwa ịdeghịe mmịrị.

Yabụ onye Commissioner nke onye nọchitere anya ya bụ Odoziakụ Happiness Akpulonu, ma bụrụ Head of Department, Pollution Control and Environmental Health n’ime ụlọ ọrụ Ministry, kwupụtara enweghị afọ ojuju ya banyere etu ndị mmadụ esịghị pụta nke ọma maka yabụ mkpocha na nzacha nke ọnwa June afọ a bụ 2026.

Ogbonna bụ onye katọrọ akparama agwa ụfọdụ ndị na agba mgbere n’ọmahịa Orie Ugba Market, Umuahia, bụ ebe achọpụtara ebe ana ekposa ahịhịa, dọzịrị aka na ntị na gọọmenti State ahụ kwere ike ịmalite mmanye iwu megide ndị na-ada iwu n’achịkwa gburugburu, dịka ọ gara n’iru gwa ndị sanitary inspectors enwere na State ahụ ka ha kwalitekwuo ọrụ ha ma gba mbọ hụ na ọrụ mkpocha na nzacha na-aga etu okwesịrị n’ime obodo mepere emepe nakwa imime obodo iji hụ na ọrịa nakwa ịdeghịe mmịrị agaghị abata na State ahụ.

N’okwu ya n’oge ana eme mkpocha na nzacha ahụ ka onye ịsị oche Abia State House of Assembly Committee on Environment bụ Kalu Mba Nwoke, rịọrọ Umuahia Capital Development Authority nakwa ndị ọzọ ka ha gba mbọ hụ na ọwara mmịrị ekpochịrị ekpochị na mpaghara Owerri Road nakwa Isi Gate areas nke Umuahia bụ nke ekpochapụrụ iji gbochie ajọ ọnọdụ ịdeghịe mmịrị, ebe onye ndu nke Hausa community bị na Abia State bụ Yaro Danlandi, ma bụrụkwa onye lekọtara ikpoghịe ọwara mmịrị ekpochịrị ekpochị n’akụkụ Ama Hausa area na Umuahia kweghachiri nkwa nkwado ha gara aka na achị State ahụ bụ Governor Alex Otti.

K’osila dị, anwụchịrị mmadụ ịrị ịsịị na ịsịị site n’aka Environmental Task Force ma kpọta ha n’ụlọ ikpe mobile court maka ịda iwu n’achịkwa gburugburu Abia State.

Ebe onye nọ n’ịsị ikpe na yabụ mobile court bụ His Worship, O. C. Ibekwe, tọghapụrụ mmadụ ịsịị n’ime mmadụ ịrị ịsịị na ịsịị ahụ anwụchịrị kwere maka ọnọdụ ahụike ha ya nakwa nkwupụta na ha bụ ụmụakwụkwọ, ebe mmadụ iteolu ka enyere iwu ka ha mee community service na Umuahia, dịka mmadụ ịrị ịse ndị ọzọ bụ ndị amara ikpe ma gwa ha kwụọ gọọmenti State ahụ ụgwọ maka ịda iwu n’achịkwa gburugburu Abia State.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited