Ndị ezinụlọ nwa amadi ahụ jitọpụrụ ọkwa onye isi ala anyi bu Late Former President Muhammadu Buhari enyela ozi ekene ha gara ndị ahụ nyere ha kwadoro mgbe ha na eri ụjọ.

Written by on July 21, 2025

Ndị ezinụlọ nwa amadi ahụ jitọpụrụ ọkwa onye isi ala anyi bu Late Former President Muhammadu Buhari kenere onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu, osote ya bu Vice President Kashim Shettima nakwa ọtụtụ ndị ọzọ welitere isi na ala anyi a, tinyekwara ndị sitere mba ụwa dị iche iche maka nkwado ha n’oge ha na eri ụjọ.

Nkea putara ihe site n’aka Malam Mamman Daura, bu onye kwuchitere ezinụlọ ahụ ma burukwa okenye nyere yabu ezigbo bukwa nke onye enyemaka ha bu Garba Shehu binyere aka na ya.

O kenere onye isi ala anyi bu President Tinubu n’ụzọ pụrụ iche, etu osiri kwupụta ụbọchị eliri Late Buhari dika ụbọchị ezumike ma were aha Late Buhari baghari afa ụlọ akwụkwọ mahadum University of Maiduguri iji kwanyere ya ugwu, ha gara n’iru kenekwa ndị aka na achi States, Ministers, ndị eze ọdinani, ndị ndu okwe ndọrọndọrọ, ndị ndu uka Muslim, ndị ndu uka Christ nakwa ndị ọnụ n’eru n’okwu sitere mba ụwa dị iche iche.

Ezinụlọ a kenekwara ndị ama ama na mba ụwa dị gụnyere, King Charles III of England, UN Secretary-General António Guterres, Deputy Secretary General Amina Mohammed, onye isi oche African Union, ndị ndu ECOWAS, nakwa nwa amadi ahụ jibu ọkwa Head of State bu General Abdulsalami Abubakar.

Ekene ha gakwara ndị governors sitere State dị iche iche ndi gụnyere, Katsina, Borno, Adamawa, Kano, Kwara, Lagos, Kaduna, Imo, Nassarawa, Bauchi, Sokoto nakwa Kebbi States, tinyekwara ndi ahụ jibu ọkwa osote onye isi ala anyi ndị gụnyere, Atiku Abubakar, Namadi Sambo, Yemi Osinbajo nakwa Ambassador Babagana Kingibe.

Ha gara n’iru kene mbọ ndị cabinet members, legislators, traditional and religious leaders, ndị ọrụ nchekwa, nakwa ndị ahụ ji ego achu nta ego ndị gụnyere, Aliko Dangote, Abdul Samad Rabiu, Muhammadu Indimi, Dahiru Mangal, Kola Adesina nakwa Nasiru Danu, tinyekwara ọtụtụ ndị ọzọ.

Dika ha rịọrọ ka Chukwu Okike Abiama Gozie mmadụ nile n’otu n’otu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited