Ndi Isi Ochichi Obodo Digasi Na Okpuru Ochichi Aninri Ekwuputala Ntukwasa Obi Ha Nyere Aka Na Achi Enugu State
Written by admin on February 28, 2026
by Chidimma Kama
Ndi Presidents General obodo di ichiche enwere na Aninri LGA nke Enugu State ekwuputala nkwado ha gaara ochichi Gov Peter Ndubuisi Mbah na achi State a okachasi dika osiri megide ngaghari iwe anoro na odi nso a mee megide okwa onye isi oche okpuru ochichi ahu.
Na okwu ogwara ndi nta akuko ka onye isi oche otu jikoro ndi Presidents General enwegasiri na obodo di ichiche na Aninri LGA bu Comrade Pius Ani mere ka amata ntukwasa obi ndi okpuru ochichi ahu nyere Gov Peter Mbah.
Comrade Ani kwuputaziri nkwado nakwa ntukwasa obi ha gaara onye isi oche okpuru ochichi ahu bu Hon Ugochukwu Nwanjoku.
Na ihe banyere ngaghari iwe ahu anoro na odi nso a mee megide okwa onye isi oche yabu Aninri LGA dika osiri metuta ntule aka okpuru ochichi ime obodo ga ewere onodu na afo a bu 2026 ka Pius Ani kporo oku udo nakwa mmekorita nwanne na nwanne eji mara ndi okpuru ochichi ahu.
Yabu onye Coordinating PG na Aninri LGA kwuputara na aka na achi State a adila na mbu kpo nzuko ndi onu na eru na okwu na okpuru ochichi di ichiche ebe anoro kwekoritara na iwe obuna sitere na ndorondoro ka aga agbasoro usoro iwu kpezie karie ibagide ogbaghara.
Okwuputara na Gov Mbah kowara mkpebi ya nyere ibiko na udo nke ndi Aninri LGA dika yabu aka na achi State mere ka amata na onye obuna tozuru oke nwere ikikere iputa zoo okwa onye isi oche okpuru ochichi ahu.
Ndi Presidents General ahu sitere Aninri LGA siteziri na onu Comrade Pius Ani boo ebubo gaara ngalaba ndi uwe oji nke Special Weapons And Tactics SWAT na State a maka ike ojo megide okpuru ochichi ahu.
Ani boro ebubo sina habu ndi uwe oji ngalaba SWAT noro na afo 2025 gara aga wakpo obodo Oduma Achara community ma bie aka ojo na akuluba ha bukwanu nke ndi obodo ahu megoro mkpesa gaara onye Inspector General ndi uwe oji nakwa ulo nzuko ukwu Senate bu ndi na elebara ya anya ka odi ugbu a.
Ogara na iru tie mkpu na oke olu ma bo ebubo sina onye isi nchu aja obodo Ohaofia Odumeze Kingdom bu mazi Donatus Ugorji nwuru na aka ndi uwe oji dika yabu ngalaba SWAT biachara nwuchie nwoke ahu.
Na ikpeazu ka Comrade Pius Ani kporo oku nkwuba aka oto na ihe niile banyere nnyocha onwu nwoke ahu na aka ndi uwe oji SWAT.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.