Oku Ogbugba Akpaala Ike Ojo Na Isi Obodo Taraba State

Written by on March 2, 2026

by Maduabuchi Onwe

Ihe mberede oku ogbugba mere na ogige ahia amara dika Mile six market dina Jalingo bu isi obodo Taraba state atapiala akuluba ndi mmadu kariri nde kwuru nde naria.

Yabu ihe mberede oku ogbugba bukwanu nke repiara ngwa ahia otutu ndi mmadu na state ahu ka ozi mere ka amata na otasuru na abali unya bu uka na yabu ahia.

Ndi huru ka yabu ihe siri mee na okwu ha gwara ndi nta akuko mere ka amata na ihe butere yabu odachi aka edochabeghi anya na oge ndeko akuko a.

Otu onye na ime ndi ahu mmiri fara na eze na aru oru isara ndi mmadu akwa na yabu ogige ahia bu Moses Baba na nke ya mere ka amata na akwa nille ndi mmadu nyere ya ka osara ha nakwa igwe ogbara ohuru oji asa akwa ka yabu oku ogbugba repiachara.

Iga echetazi na ihe mberede oku ogbugba megoro na Taraba state kpomkwem na Jalingo na afo a bu 2026 erugo iri abuo na onuogugu.

Na okwu ya ka aka na achi state ahu bu Gov Agbu Kefas mere ka amata na ya eguzobego otu committee ga esi imi nnyocha na ala choputa ihe na ebute yabu oku ogbugba kwamgbe kwamgbe na state ahu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited