Aka Na Achi Rivers State Emela Mkpolite Na Okwa Ndi Commissioners Ohuru

Written by on March 3, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Aka na achi Rivers State bu Gov Siminalayi Fubara akpolitela ndi Commissioners ohuru ma ziga aha ha na ulo nzuko omebe iwu State ahu maka nnyocha na nkwado ha dika osiri di na iwu na achi ala anyi.

Nke a putara ihe taata bu Tuesday na Port Harcourt site na ozi onye ndeko na okwa Clerk yabu ulo nzuko bu mazi Emeka Amadi nyefere ndi nta akuko.

Mazi Amadi kowara na obu mmadu iteolu ka ha di bu ndi Commissioners ahu Gov Fubara kpolitere na okwa ohuru.

Onyeziri aha ha dika: Prof Datonye Alasia, mazi Tonye Bellgam, Temple Nwofor, Peters Nwagor, Charity Deemua nakwa Tamuno Williams.

Ndi ozo gunyere: Lekue Kenneth, Otonye Amachree nakwa Amairigha Hart.

Mazi Emeka Amadi gwaziri ndi a akpolitere na okwa Commissioners ka ha wetara ulo olu ya mpempe akwukwo ndeko niile banyere ha di iri ano na onu ogugu nakwa akwukwo gosiri nzere mmuta ha gunyere ka ha siri nwego nrube isi na ikwu utu isi maka nnyocha ha na ulo nzuko ahu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited