Ndi Uwe Oji Akowala Etu Esi Toro Umuaka Ozo Na Ebonyi State
Written by admin on March 3, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ndi uwe oji ala anyi na Ebonyi State emela ka amata na obu eziokwu bu ntori atoro umuaka ato bucha umunne site na aka onye kwatara ohuru na ebe obibi ha dina obodo akporo Nwezenyi nke Igbeagu na Izzi LGA na State ahu.
Nke a putara ihe na ozuzu oke ya taata bu Tuesday na ogige Police Command’s Headquarters dina Abakaliki site na ozi onyefere ndi nta akuko bu onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na State ahu bu SP Joshua Ukandu.
SP Ukandu nyere aha habu umunne ato atoro na ike dika: Favour, Obinna, nakwa Kamso Okeoha.
Okowara na obu na ubochi Saturday nke ngwucha izu uka gara aga ka yabu onye kwatara ohuru na udi nwa bekee kporo new tenant ma burukwa nwaanyi toro habu umuaka ato oge nne ha puru.
Yabu onye Police Public Relations Officer PPRO na Ebonyi State gwaziri ndi nta akuko na nnyocha na aga na iru ichoputa ma naputa umuaka ahu atoro na ike.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.