Aka Ndi Uwe Ojii Akpatala Otutu Ndi Otu Nzuzo Na Enugu State
Written by admin on July 17, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu

NIGERIA-POLICE-FORCE-
Ndi uwe ojii ala anyi na Enugu State enyela nkowa na ozuzu oke etu ha siri nwuchiko umunwoke di iri abuo na ufodu mpaghara State a maka ebubo agwa ekperima otu nzuzo ma naputakwa otutu ihe ana enyoenyo na aka ha.
Na ozi onyefere ndi nta akuko unya bu Thursday na ogige Police Command’s Headquarters dina isi obodo Enugu ka onye mmekorita ohaneze nyere habu ndi uwe ojii na State a bu SP Daniel Ndukwe mere ka amata na aka ndi uwe ojii sitere alaka Anti-Cultism nke ngalaba Violent Crime Response Unit kpatara umunwoke abuo na ubochi Tuesday gara aga na mpaghara Banana Estate nke Independence Layout dina isi obodo Enugu maka ebubo otu nzuzo, nke na ha ji ogbatumtum ukwu abuo nakwa nke ukwu ato akusu mana ezu ndi mmadu ori na mpaghara ahu ganye oge habu ndi uwe ojii gara nwuchiko ha.
SP Ndukwe gwara ndi nta akuko na ndi uwe ojii ozo no olu ngaghari noro na abali asaa nke onwa a bu July nwuchiko umunwoke isii na ebe nzochi ekperima ha dina Emene nakwa Eke Obinagu didebere isi obodo Enugu ma naputa ha ihe ana enyoenyo na obu ogwu ike cannabis sativa, nke methamphetamine amakariri dika mkpurummiri nakwa ngwugwu cocaine.

ENUGU POLICE
Na aka nke ozo ka ndi uwe ojii nokwara na otu ubochi ahu nwuchiko umunwoke iri na abuo ozo ana enyoenyo na ha bu ndị otu nzuzo Black Axe Confraternity amakariri dika Aye na ebe ha no ogbako mmeme otu nzuzo akporo 7/7 anniversary na obodo Owerre Eze-Oba dina Udenu LGA nke State a ma naputa ha otu owa nku bu axe, ngwa egwu nakwa ogbatumtum ukwu abuo motorcycle di iri na ano.
Yabu onye Police Public Relations Officer PPRO na State a mere ka amata na nnyocha kana aga na iru inwuchiko ndi nke riri mbombo oso na ime habu ndi otu nzuzo yanakwa imata ubara ike ojo ha kpagoro na State a.