Ndi Uwe Ojii Na Anambra State Amalitela Icho Onye Nkuzi Ji Utari Piagbuo Nwata Akwukwo Na State Ahu
Written by admin on July 18, 2026
by Oluchi Okafor-Iloh
Ndi uwe ojii ala anyi na Anambra state amalitela icho otu onye nkuzi eboro ebubo si na oji utari piagbuo nwata akwukwo gbara afor Iri na abuo n’otu ulo akwukwo di na Adazi-Ani, na Anaocha LGA nke Anambra state site n’ atumatu nchekwa ohuru akporo Safe school initiative nke onye ndu ha bu Assistant commissioner ndi uwe oji na ahu maka olu bu ACP Harrison oruruo.
Nkea putara ihe site n’ozi onye mmekorita ohaneze nyere habu ndi uwe oji na Anambra state bu SP Tochukwu Ikenga nyefere ndi nta akuko unya bu Friday ma buru ebe onoro kowa,na ha nwetara ozi banyere odachi a n’abali nwanne unya bu Thursday abali Iri na isii nke onwa a , kpatara ndi otu ha si na ngalaba Neni jiri zaa yabu oku ozugbo ma buga nwata akwukwo ahu n’ulo ogwu ebe dibia oyibo noro kwuputa na anwuola tupu ha erute.
Yabu onye PPRO meziri ka amata na etinyela ozi nwata ahu n’oba nchekwa ozi di na ulo ogwu ahu maka ime ya nnyocha akporo Autopsy,dika ha kowara na nnyocha mbuzo emere n’egosi na enwere akara ihe mmeru ahu n’akuku di iche iche n’ahu nwata ahu .
K’osiladi habu ndi uwe oji ala anyi na Anambra state kweziri nkwa si na ha ga akpupu onye obula aka ya di n’onwu nwatakiri a ulo ikpe ma mekwa ka amata na ha ga n’aga n’iru ichekwaba umu akwukwo site na usoro nke Safe school initiative.
N’ikpeazu ka ha kpokuziri ohaneze onye nwere ozi obula ga enye aka nwuchie yabu onye ana enyo Ka okpoturu ulo olu ndi uwe oji di ya nso ma obukwanu kpoturu ha n’akara 07039194332

