Atuola Otu Onye Dibia Anya Nzu Ama’Ama Na Anambra State Nga Afo Isii Zuru Oke

Written by on July 18, 2026

by Oluchi Okafor-Iloh

Ulo ikpe Anambra state high court ji Awka mere isi onodu atuola otu onye dibia anya nzu ama’ama na state ahu enyere aha ya dika Onyebuchi Okocha amakariri dika “Onyeze jesus” nga afor isii zuru oke tinyekwara nra ego di nde naira Iri abuo (#20million).

Oka ikpe no n’isi ikpe ahu bu justice Jude Obiora nyere nkabi ikpe ahu oge achoputachara na odara iwu nke iduhie ohaneze uzo n’udi na onwere Ike nke mmuo iba ndi mmadu ogaranya site n’ ime omenala n’uzo megidere usoro iwu nchekwa Anambra state.

Ulo ikpe a nwetakwara ozi na Okocha sitere n’usoro owa ozi jiri ihe onyonyo n’eme ihe ngosi nduhie uzo ahu.

Ozi kowara na tupu akabiere ya ije nga,na nwa amadi a rioro ka agbaghara ya kwere maka na obu nke mbu ya ikpa agwa di etua. ogakwara n’iru gwa ulo ikpe na ya no n’aka ndi uwe oji kemgbe onwa February afor gara aga n’ahughi nwunye ya nakwa umu ejima ya anya.

N’okwu ya ka nwa amadi ahu ji okwa commissioner n’ahu maka mgbasa ozi na Anambra state bu Dr Law Mefor noro nabata nkabi ikpe ahu dika nke ga ejigide iwu nchekwa obodo state ahu ma buru ihe Ido aka na nti nyere ndi ozo ga etinye aka n’udi agwa di etua.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited