Ufodu Ndi Mmadu Anwuola Na Ihe Mberede Okporo Uzo Mere Ohuru Na Anambra State
Written by admin on July 18, 2026
by Oluchi Okafor-Iloh
Ulo olu njem awele okporo uzo ala anyi bu Federal Road Safety Corps (FRSC) ngalaba ya nke Anambra state emela ka amata na ha achoputago n’obu mmadu ato tufuru ndu ha n’ihe mberede okporouzo mere n’ututu unya bu Friday abali Iri na asaa nke onwa a ,n’akuku ulo uka St. Jude catholic church dina Adazi- Ani n’ogolgo uzo Nnobi -Agulu-Awka Road.
Ulo olu FRSC mere Ka amata na yabu ihe mberede mere onwe ya naani na otu ugboala na udi akporo lone auto crash megide nnukwu ugboala mkpata ego nke mercedes -Benz 606 commercial truck, nwere akara registration number dika XB270NNL, ebe nnyocha mbuzo ha mere n’egosi na yabu ugboala bu umu nwoke asaa nwere ihe mmebi nke na onye okpu ugboala ahu enweghi Ike ijikwanata ya, kpatara ojiri ghoro oku,ma kpokasia n’okporouzo, taa isi mmadu ato ma nye mmadu ano ndi ozo nnukwute ihe mmeru ahu.
Ha gakwara n’iru kowa na ndi olu nnaputa mere ngwangwa ga n’ogige ebe odachi a mere ,gba mbo kpochapu ugboala truck ahu gbara oku ma hu na okporouzo n’aga siriri werere.
N’okwu ya banyere odachi a Ka onye sector commander ulo olu FRSC na state ahu bu corps commander Bridget Asekhauno, buru ozi ntasi obi gara ezi n’ulo ndi nke ha so na yabu odachi ,ma rio ndi okpu ugboala mkpata ego ha gba mbo hu na onodu ugboala ha di mma tupu ha ebuputa ya n’okporouzo.
