Maka Onwu Mary Habila: Atiku Abubakar Akpola Oku Ugbonwamkpi Megide David Umahi

Written by on July 18, 2026

by Chidimma Kama

Onye ahu ji okoloto otu ndorondoro African Democratic Congress ADC azo okwa onye isi ala na ntule aka ochichi afo 2027 bu Alhaji Atiku Abubakar akpokuola President Bola Ahmed Tinubu ka onye ntuzi aka ka miniser ala anyi na ahu maka olu bu Sen David Umahi ritugodu na okwa olu ya maka ebubo onwu mgbagoju anya otu na ime onye olu aruike ya bu nwada Mary Habila.

Nwada Habila bu onye olu aruike ulo ogwu mahadum David Umahi Federal University of Medical Sciences Teaching Hospital ma buru onye ezigara olu dika otu na ime ndi olu aruike yabu Minister ka ozi mere ka amata na obu na abali iri abuo na asaa nke onwa June gara aga ka onwuru na uzo mgbagoju anya na bee Sen Umahi dina Uburu, na Ohaozara LGA nke Ebonyi State.

Na okwu ya banyere nke a site na ozi oweputara na owa ozi mmekorita ohaneze ka Atiku Abubakar kporo oku ka Sen Umahi gba alukwaghim na okwa Minister ganye na emecha nnyocha ihe butere onwu yabu nwagbobia onye olu aruike nwuru na bee ya.

Yabu onye jiburu okwa osote onye isi ala Nigeria na oge ochichi Olusegun Obasanjo kwuputara mmetuta onwere nyere etu esi eso ihe banyere onwu mgbagoju anya a ma kpo oku nkwuba aka oto nakwa nnyocha kwuru onwe ya na udi okporo Transparent and Independent Investigation na onodu a.

Ozi kowara na yabu nwada Mary Habila nwuru na bee Sen Umahi dina Uburu, Ohaozara LGA nke Ebonyi State di afo iri abuo na isii ma buru onye sitere obodo Nok nke Southern Kaduna dina Kaduna State na mgbago ugwu North West ala anyi.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited