Maka Onwu Mary Habila: Onu Na Ekwuru Ndi Uwe Ojii Nigeria Adola Aka Na Nti Megide Ozi Awara’awa

Written by on July 19, 2026

by Chidimma Kama

Onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndi uweojii ala anyi na isi ụlọ ọrụ izugbe ha akpọrọ Force Headquarters, alaka ya arụnyere na Lagos State bu CSP Nkeiruka Nwode arịọla ụmụ afọ Nigeria ka ha zeere idi na agbasa ozi awarawa dika osiri mmetuta onwu nwagbobia onye olu aruike ahu nwuru na udi mgbagoju anya bee Sen David Umahi ji okwa Minister ala anyi na ahu maka olu bu nwada Mary Habila.

Na ozi onyefere ndi nta akuko unya bu Saturday site na isi ulo olu yabu Force Headquarters Annex dina Lagos State ka CSP Nwode kowara onwu nwada Mary Habila dika odachi, ma buru ozi nkasi obi gaara ezinulo ya, ndi enyi nakwa ndi niile onwu ahu metutara.

Yabu onu na ekwuru isi ulo olu izugbe ndi uwe ojii ala anyi ma buru nwada Ezza North LGA nke Ebonyi State kpokuziri ndi niile odi na aka ka ha saa anya na mmiri mee nnyocha kwu oto, gunyekwara nnyocha aru ozu akporo autopsy imata ihe niile banyere onwu mgbagoju anya yabu nwagbobia onye olu aruike.

Ọ gakwara n’iru riọ ọhaneze ka ha hapụ ndị okwu ahụ dị n’aka ka ha mee nnyocha ha na eme ma ghara iji aka ha na eme mkpebi tupu nke bụ eziokwu apụta ihe.

N’ikpeazụ ka yabụ ọnụ na ekwuchitere ndị uweojii rịọrọ Chukwu Okike Abiama ka onye mkpụrụ obi Mary Habila ebe ezumike ebebe, ma nyekwa ezinụlọ ya obi ndidi ha ga eji die yabụ ọnwụ nwa ha nwanyị, dịka onwere nkwenye na nnyocha ga ewepụta nke bụ eziokwu ihe kpatara ọnwụ nwa ada ahụ.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited