Ndị Uweojii Na Bayelsa State Anwụchịela Onye Ana Enyoenyo Maka Imebi Akụrụngwa Ohaneze Na State Ahụ

Written by on July 19, 2026

by Chidimma Kama

 

Ndị uweojii ala anyị na Bayelsa State anwụchịela onye nke abụọ ana enyo enyo eboro ebubo na aka ya dị n’imebi akwa mmịrị Angiama-Oporoma Bridge dị na Southern Ijaw LGA na State ahụ.

Habụ ndị uweojii mere ka amata na ngalaba ha nke State Criminal Investigation Department jị amamihe ha arụ ọrụ iji nwụchikọ ndị niile aka ha dị n’imebi akụrụngwa ahụ.

N’ozi pụtara ihe site n’aka onye mmekọrịta ọhaneze nyere habụ ndị uweojii na State ahụ bụ DSP Musa Mohammed, kọwara na onye nke mbụ enyere aha ya dịka Daniel Tarila gbara afọ ịrị abụọ na ịsịị, sitere Angiama community, bụ onye aka kpatara na abalị atọ n’ọnwa July afọ a anyị nọ n’ime ya dịka oji igwe iron plates abụọ eboro ebubo na owepụtara na akwa mmịrị ahụ.

Nigeria police

Yabụ onye Police Public Relations Officer PPRO kọwara na Tarila nọ na ulo nga Okaka Custodial Centre ganye mgbe aga akpụkpọ ya n’ụlọ ikpe, ọ gbakwụnyere na onye nke abụọ ahụ ana enyo enyo enyere aha ya dịka Peres Daniel gbara afọ ịrị atọ na otu, bụ onye eboro ebubo na ọgbanarịrị nwụchị na mbụ bụ onye emechara nwụchịe na abalị ịrị na anọ n’ọnwa July n’ihe dịka elekere ịse nke mgbede na Obele Street, Yenagoa site n’ozi ha nwetara ma mekwa ka amata na nnyocha ka na aga n’iru k’ọdị ugbua dịka aga akpụpụ ndị a ana enyo enyo n’ụlọ ikpe ngwa ngwa ha mechara nnyocha ha.

Na nke ya ka Commissioner ndị uweojii na State ahụ bụ CP Iyamah Daniel Edebor, kweghachịrị nkwa njikere habụ ndị uweojii dị itinye uchu n’ọrụ iji nye nchekwa zuru oke gara akụrụngwa ọhaneze na State ahụ, dika ọ rịọrọ ọhaneze ka ha kee nkwụcha ma kpọtụrụ ndị ọrụ nchekwa mgbe ọbụla ha hụtara ije agwọ na gburugburu ha.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited