Amala Mmadu Abuo Ikpe Onwu Maka Ima Nwaanyi Elu Na Ike Na Anambra State

Written by on July 19, 2026

by Maduabuchi Onwe

Amala mmadu abuo ikpe onwu na Anambra state ka akwuo ha udo maka ikwaso otu nwata nwaanyi iko na ike ma gbuo ya na state ahu.

Nke a putara ihe site na nkabi ikpe nke ulo ikpe state High court nke ji Ogidi mere isi onodu kabiri na isi mmadu abuo ahu na odi nso a bukwanu nke okaikpe Justice U.l. Ndigwe noro na isi ya.

Iga echetazi na mmadu abuo ahu nke gunyere: Elochukwu Belonwu nakwa Chukwuebuka Ofokwu ka ozi mere ka amata na ha jidere otu nwata nwaanyi gbara afo iri na asaa nwere isi mgbaka enyere aha ya dika Jennifer Anene wee kwaso ya iko na ike ma gbuo ya na afo 2020 na Anambra state.

Na ikpeazu ka justice U.l Ndigwe katoro yabu ajoo agwa, ma kwuputa na nke a ga abu nnukwute ihe mmuta diri umunwoke nille aka oru ha bu ikwaso umunwaanyi iko n’ike na Nigeria.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited