Ndi Oji Egbe Eri Atorola Ndi Bu Ozu Nne Ha Site Abuja Aga Ili Na Benue State
Written by admin on July 19, 2026
by Maduabuchi Onwe
Ndi oji egbe eri ana amaghi ndi habu atorola umunne ato ebe ha si Abuja bu isi obodo Nigeria wee buru ozu nne ha na aga obodo ha dina Benue state unya bu Saturday.
Habu umunne ato ka ozi mere ka amata na habu ndi omekome toro ha kpom kwem na okporo uzo Ogobia-Otukpo nke dina Ohimini local government area nke Benue state.
Akuko gakwara na iru mee ka amata na habu mmadu ato buu ozu nne ha ahu wee na aga na obodo ha bu lklenyi nke dina Okpokwu local government area maka ikwanyere ya ugwu ikpeazu oge habu ndi ntori mmadu toro ha.
Na ikpeazu ka ndi uwe ojii ala anyi na Benue state mere ka amata na ozi aka erutabeghi ha aka gbasara yabu ajoo onodu na oge ndeko akuko a.
