Pastor Paul Enenche Akọwala Egwu Afrobeat Dịka Nke Na Eduhie Ndị Na-Eto Eto Uzọ na Nigeria

Written by on August 3, 2026

by Chika Nwazu

Nnukwute onye ụkọ Chukwu nke ụlọ ụka Dunamis International Gospel Centre bụ Dr Paul Enenche akọwala egwu awantilo akpọrọ Afrobeats dịka nke na eduhie ndị na-eto eto ụzọ kworo maka ihe ọ kọwara sị na egwu ndị ahu anaghị enwe isi na ọdụ.

N’okwu ya n’oge ofufe nrọ nke ndị ụlọ ụka ahụ ụnyaahụ bu uka ka Dr Enenche kwuru na ndị na etiputa egwu ndị ahụ amaghị ihe ha na-agụ kama na ọ bụ naanị iduba ndị na-eto eto na ọnwụnwa.

Ọ nọrọ n’oge ahụ rịọ ogbo ha na-abụ abụ ozioma ka ha jisi ike kuputa egwu ndị ga akpọghachi ndị ntorobịa n’ezi ụzọ.

Ọ gbakwụnyere na ha ga a chịkọba ọgbakọ aga anọrọ kụọ egwu ndị eji eto Chineke iji kpọpụta ndị ntorobịa n’aka onye iro bụ ebe egwu awantilo kpobagoro ha.

O kwuru na ya nwere olileanya n’oge na-adịghị anya ka aga amalite nuwa abụ ozioma na egwu ndị ọzọ eji eto Chineke nke ga egosi ndị ntorobịa ezi ụzọ ha ga-eso.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited