Alukwaghim NFF: Tinubu Enyela Ntuzi Aka Nhazighari Gaara Ngalaba Egwuregwu Ukwu Ala Anyi
Written by admin on August 28, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu enyela ntuzi aka ime nhazighari zuru oke na udi nwa bekee kporo comprehensive reform gaara ngalaba egwuregwu ball ukwu Nigeria.
Nke a bu kwere maka adighi ike bu otu egwuregwu ball enwegasiri na ala anyi inweta ntozu oke maka asompi egwuregwu na ogogo mba uwa.
Ntuzi aka onye isi ala anyi a na abia unya bu Thursday dika ogasiri elekere onemone onye isi na okwa President ulo olu Nigeria Football Federation NFF bu Ibrahim Musa Gusau, onye Secretary General ulo olu a bu Mohammed Sanusi nakwa ndi ozo sona otu nchikwa yabu NFF gbara alukwaghim na okwa ochichi ha.
Na ozi oweputara yabu unya bu onye ndumodu puru iche nyere onye isi ala na ihe metutara mgbasa ozi nakwa atumatu bu Bayo Onanuga ka President Tinubu kowara na nhazighari a onyere ntuzi aka ya ga eme ka ngalaba egwuregwu ball ukwu Nigeria merie ajo onodu ima afo na ala nke ntozu oke asompi ogogo mba uwa onona ime ya.
Onye isi ala anyi kowara ajo onodu ndala azu na yabu ngalaba egwuregwu dika ume ngwu sitere na onodu nhazi ochichi ngalaba egwuregwu ahu.

