EFCC Ekwuputala Onye Jiburu Okwa Governor Bayelsa State Dika Onye Ana Achoghari Inwuchiko Maka Ebubo Agwa Ekperima Ego
Written by admin on September 1, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ulo olu ala anyi ahu na ebu agha emegide ima ego nakwa akuluba ohaneze ndi Nigeria mmiri ojo akporo Economic and Financial Crimes Commission EFCC agwala onye ahu jiburu okwa Governor Bayelsa State bu Timipre Sylva ka owuchie izara onu ya na ebubo ori ego di nde Dollar iri na ano na uma iri asato na isii.
Nke a putara ihe unya bu Monday site na ozi onyefere ndi nta akuko bu onu na ekwuru ulo olu EFCC bu Dele Oyewale dika nzaghachi gaara Sylva na ebubo oboro sina EFCC ekwetago ka otu ndorondoro All Progressives Congress APC jiri ya dika mma agha eji emegide ndi mmadu.
Ozi kowara na yabu Former Gov Timipre Sylva jiburu okwa Minister ogo nta ala anyi huru maka mmanu petrol na oge ochichi Late President Muhammadu Buhari noro unya bu Monday gba alukwaghim na otu ndorondoro APC ma boo ndi ndu otu ndorondoro ahụ ebubo igbaghapu ebum na uche ejiri guzobe ya, dika okatoro ihe okowara dika amaghi achi nke ochichi APC di ugbu a na ala anyi.
Sylva boziri ebubo sina ochichi APC ji ulo olu EFCC akpagbu ndi ma obu otu na anaghi akwado ya.
Ngwangwa ebubo a biachara ka EFCC sitere na onu Oyewale mee ka amata na otegori ulo olu ahu na achoghari nwa amadi a ka obia zara onu ya na ebubo ori nde kwuru nde Dollar ana ebo ya.

