Mmachi Njem Na Oge Abali Na Enugu: Gov Mbah Ebugala Ya Kwa Elekere Iri Abali Niile
Written by admin on October 18, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Aka na achi Enugu State bu Gov Peter Ndubuisi Mbah anorola na ubochi Saturday bu abali iri na asaa nke onwa October afo 2026 wepu mmachi njem okporo uzo ahu dibu na State a malite na elekere iteolu kwa abali ka obuziri nke gana amalite na elekere iri nke abali niile.
Gov Peter Mbah gakwara na iru nye iwu ikwusi inye ndi ogbatumtum ukwu ato bu tricycle amakariri dika Keke akwukwo ticket ejibu anapu ha ego na State a.
Yabu aka na achi Enugu State mere ka ihe ndi a puta ihe na isi obodo Enugu na njem nkwado One-Million-Man march otu jikoro ndi keke akporo Enugu State Tricycle Riders Union mere ya.


