Ntuli Aka Ochichi Afo 2027: Otu NANS Ekwuputa Gov Nwifuru Dika Onye Hana Akwado
Written by admin on October 19, 2026
by Maduabuchi Onwe
Otu jikotara umu akwukwo na ala anyi amara dika National Association of Nigerian Students NANS ngalaba ya nke Ebonyi State akagbuola ozi ahu ana ebughari n’owa ozi mmekorita ohaneze na ha ekwuputago nkwado ha gara nwamadi ahu ji otu ndoro ndoro ochichi People’s Democratic Party PDP wee na aputa izo okwa governor na State ahu na afo 2027 bu Chief Ifeanyi Chukwuma Odii.
Nke a putara ihe site n’onu habu otu NANS n’ozi ha nyefere ndi nta akuko na ubochi Saturday na Abakaliki bu isi obodo Ebonyi state.
Kosiladi, habu otu gakwara n’iru kwuputa hoha na obu aka na achi Ebonyi State bu governor Francis Ogbonna Nwifuru ka ha ga akwado, ma ona eje eje ma ona ala ala na ntuli aka ochichi izugbe afo 2027 na State ahu kwere maka ukwu dimkpa yabu nwamadi zogoro na ngalaba agumakwukwo state ahu kamgbe obanyere na okwa ochichi na afo 2023.
Habu otu n’ikpazu gakwara n’iru kwunwo mkpebi ha gara atumata ibughari okwa ochichi site na ogbonta vote ndi ahu enwegasiri n’Ebonyi state nke gunyere; Ebonyi North, Ebonyi South nakwa Ebonyi central senatorial districts iji kwalite ochichi egbe bere ka ugo bere na state ahu.
