YYP Ayiola Ulo Nzuko Omebe Iwu Nigeria Ka Ogbochie Tinubu Iga Bite Ego Ohuru
Written by admin on October 29, 2026
by Maduabuchi Onwe
Otu ndoro ndoro ochichi Young Progressive Party YPP akpokuola ulo nzuko omebe iwu ogogo etiti ala anyi ka ha gbochie president Bola Ahmed Tinubu iga bite ego ahu ochoro iga bite na mba Ofesi wee ruo oge aga emecha ntuli aka ochichi izugbe afo 2027.
Yabu otu ndoro ndoro ochichi YPP kwuputere nke a dika president Tinubu na ama amuma ibite ego ohuru di ijeri dollar iri abuo na uma iri ise na abuo tinyekwara otu ijeri euro na uma iri ano na ise na mba Ofesi dika ana akwadebe ntuli aka ochichi afo 2027.
Nwamadi ahu ji otu ndoro ndoro ochichi YPP wee na aputa izo okwa onye isi ala na afo 2027 bu Architect Peter Agada kwuputere nke a na Abuja bu isi obodo Nigeria dika omere ka amata na nnyocha n’egosi n’ugwo Nigeria ji di otu tari naria iri isii na isii na uma iri asaa na iteolu.
N’ikpazu ka okpokuziri government ogogo etiti ala anyi ka oweputere ohaneze Nigeria ka osiri wee gbarie ego ndi nke ebitegoro n’oge gara aga nakwa ihe ndi eji ha wee ruputa, mere ha ji agbakiri ala iga bite ego ozo.


