Ntuli Aka Ochichi Afo 2027: Peter Obi Adola Aka Na Nti Megide Nruru Aka Na Ntuli Aka Ochichi A
Written by admin on October 29, 2026
by Maduabuchi Onwe
Nwamadi ahu ji otu ndoro ndoro ochichi Nigeria Democratic Congress NDC wee na aputa izo okwa onye isi ala na afo 2027 na Nigeria bu maazi Peter Obi eforola ntutu taa ikpupu onye obuna mere nruru aka na ntuli aka ochichi izugbe afo 2027 ulo ikpe, ma gba mbo huna enyere onye ahu ntaramahuhu kwesiri ya.
Yabu nwamadi chiburu Anambra state mere ka nke a puta ihe na ogbako ime ulo nke otu ndoro ndoro ochichi NDC were onodu na Nasarawa state unya bu Wednesday.
Obi gakwara n’iru kwuputa hoha na ya ga achitu ma gba mbo huna aturu ndi ahu nille ji asambodo adigboroja wee banye n’okwa ochichi na Nigeria nga ma ya banye na okwa ochichi dika onye isi ala na afo 2027.
N’ikpazu ka omeziri ka amata na ya ga eme mkpocha na nzacha gara agwa ekperima na ulo olu na ahu maka ntuli aka ochichi na ala anyi bu lndependent National Electoral Commission lNEC ma ya banye na okwa ochichi iji huna ntuli aka ochichi obuna ka emere na uzo kwu oto.

