Maka Mmeme Christmas, Afo Ohuru: Govt Etiti Enyela Ntuzi Aka Olu Ndozighari Na Okporo Uzo Etiti Niile Dina Nigeria
Written by admin on November 15, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Minister ala anyi na ahu maka olu bu Sen David Umahi enyedebela ndi Zonal Directors ulo olu Ministry ya izu uka ato ka ha huna okporo uzo ochichi etiti niile enwere na ala anyi a nona ezi onodu ogiga ugboala nke oma dika ana akwadobe mmeme Christmas nakwa nke afo ohuru.
Sen Umahi nyere ntuzi aka a na nzuko yana ndi Coordinating Directors na ahu maka olu nakwa ndozighari okporo uzo gunyere akwa mmiri nakwazi ogbo ha nke Zonal Directors nwere na Abuja.
Na ozi onyefere ndi nta akuko unya bu Saturday banyere nzuko a bu onye Director na ahu maka mgbasa ozi nakwa mmekorita ohaneze nyere ulo olu Ministry ogogo etiti na ahu maka olu bu Mohamed Ahmed ka Umahi noro kowa ime habu okporo uzo ka onoro na uzo ogiga ugboala dika ihe kachasi mkpa.
Okwuputara na nke a ga enyere umu afo Nigeria aka na njem ha ga emegasi maka mmeme Christmas nakwa nke afo ohuru.

